Job 16

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara sị:

2“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;
ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.
3Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị?
Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?
4Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,
ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m;
enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu,
ma fufekwaa isi
Ifufe isi nʼihu mmadụ, bụ omume nlelị anya. Ọ pụtara na e nweghị nsọpụrụ nʼebe onye dị otu a nọ. Abụ 22:7; Akw 2:15; Mat 27:39
m megide unu.
5Ma ọnụ m ga-agba unu ume;
nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.

6“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,
ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?
7Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,
i tidakwala ezinaụlọ m.
8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;
ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.
9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,
ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;
onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.
10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,
ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,
jikọtakwa onwe ha megide m.
11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.
12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.
O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.
O meela m ihe ịgba ụta ya;
13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.
Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko
mee ka oluilu m wụsịa nʼala.
14Mgbe niile, ọ na-emegide m;
ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.

15“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,
liekwa ikuanya
Maọbụ, mpi
m nʼime ntụ.
16Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa,
onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;
17ma aka m emeghị ihe ike ọbụla,
ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.

18“Ala, biko, ezokwala ọbara m;
mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!
19Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe,
onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.
20Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m,
dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.
21Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke
dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.

22“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga
tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.
Copyright information for IboBIU